2 Chronicles 12:2-9

2Nʼihi na ha ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị, Shishak eze Ijipt busoro Jerusalem agha nʼafọ nke ise nke ọchịchị eze Rehoboam. 3O ji otu puku ụgbọ agha na narị abụọ, na ndị agha na-agba ịnyịnya dị puku iri isii, na ndị agha ụkwụ ala, ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị agha si Libịa, Sukim na Kush, ndị sooro ya site nʼala Ijipt. 4O merikwara obodo niile e wusiri ike nke Juda ma bịarukwaa Jerusalem.

5Mgbe ahụ, Shemaya onye amụma bịakwutere Rehoboam na ndịisi Juda niile, ndị zukọtara na Jerusalem nʼihi egwu Shishak, sị ha, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, ‘Unu ahapụla m, nʼihi ya, ahapụkwala m unu, nyefee unu nʼaka Shishak.’ ”

6Ndị ndu Izrel na eze wedara onwe ha nʼala sị, “Onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ.”

7Mgbe Onyenwe anyị hụrụ otu ha si weda onwe ha nʼala, okwu Onyenwe anyị bịakwutere Shemaya, sị, “Ebe ọ bụ na ha ewedala onwe ha nʼala, agakwaghị m ebibi ha kama aga m eme ka ha nwe nzọpụta ngwangwa. Agakwaghị m eji Shishak gosi Jerusalem oke iwe m. 8Ma otu ọ dị, ha ga-abụrụ ya ohu, ka ha nwe ike mata ọ dị iche dị nʼetiti ijere m ozi na ijere ndị eze ala ọzọ dị iche iche ozi.”

9Mgbe Shishak eze Ijipt busoro Jerusalem nʼagha; o bukọrọ akụ niile dị nʼime ụlọ Onyenwe anyị, na akụ niile dịkwa nʼụlọeze. Ọ kwakọọrọ ihe niile, werekwa ọta ọlaedo ndị ahụ Solomọn kpụrụ.
Copyright information for IboBIU